8 O we were n'onwe-ya ejùjù iji kọ onwe-ya ọkọ; ya onwe-ya nānọdu kwa n'etiti ntu.
9 Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.
10 Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.
11 Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi.
12 Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di.