10 N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga;Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
11 Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.
12 Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya;Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
13 Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya?Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.
14 N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm:Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.
15 N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya;Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya.
16 N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri,Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji: