7 N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.
8 Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya;M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:
9 M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.
10 N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga;Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
11 Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.
12 Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya;Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
13 Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya?Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.