11 M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
13 Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.
14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.
15 Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.
16 Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,Dozie uwe dika urọ;
17 O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.