14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.
15 Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.
16 Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,Dozie uwe dika urọ;
17 O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.
18 O wuwo ulo-ya dika nla,Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.
19 O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.
20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.