8 N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?
9 Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?
10 Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?
11 M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
13 Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.
14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.