1 Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.
2 Job we za, si:
3 Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì,Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.
4 Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri;Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya,Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.
5 Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya;Ka igwe-oji biri n'elu ya;Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.