14 N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem;M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.
15 Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ:Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.
16 M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu,N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?
17 M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem,M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
18 N'ihi na ejuputaram n'okwu;Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.
19 Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu;Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.
20 Ka m'kwue, ka aru we dajuam;M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.