26 Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ;O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya:O we nyeghachi madu ezi omume-ya.
27 Ọ nābù abù n'iru madu, si,Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume,Ma ọ baghm n'ihe:
28 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù,Ndum gēle kwa ìhè.
29 Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu,Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n'ebe madu nọ,
30 Ime ka nkpuru-obi-ya si n'olùlù lata,Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè.
31 Job, ṅa nti, gem nti:B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu.
32 Ọ buru na okwu adi n'ọnu-gi, zaghachim:Kwue, n'ihi na ọ dim utọ igu gi n'onye ezi omume.