1 Elaihu we nāza, si,
2 Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile;Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.
3 N'ihi na nti nānwa okwu nile,Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.
4 Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé:Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma.