1 Elaihu we nāza, si,
2 Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile;Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.
3 N'ihi na nti nānwa okwu nile,Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.
4 Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé:Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma.
5 N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,Ma Chineke ewezugawo ikpém:
6 M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém?Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.
7 Òle madu di ka Job?Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,