12 E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu,Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.
13 Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa?Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?
14 Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya,Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n'ebe Ọ nọ;
15 Anu-aru nile gēkubìkọ ume,Mdu gālaghachi kwa n'ájá.
16 Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka:Ṅa nti olu okwum nile.
17 Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi?Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe?
18 Àgāsi eze, Gi onye jọb͕uru onwe-gi?Àgāsi ndi amara aha-ha, Unu ndi-nmebi-iwu?