5 N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,Ma Chineke ewezugawo ikpém:
6 M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém?Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.
7 Òle madu di ka Job?Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,
8 Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha,O we so ndi nēmebi iwu jeghari.
9 N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara maduMb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.
10 N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti:Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu;Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.
11 N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya,Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.