1 Elaihu we nāza, si,
2 Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi?Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?
3 Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi?Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?
4 Mu onwem gāzaghachi gi,Gi na ndi-eyì-gi.
5 Legide elu-igwe anya, hu;Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi.
6 Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya?Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya?
7 Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya?Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi?