7 Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.
8 Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.
9 Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya:Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala:Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.
10 Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.
11 Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo:O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.
12 Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu:Echezọla ndi ewedara n'ala.
13 N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke?Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju.