Abù Ọma 145 IGBOB

Abù Ọma otuto; nke Devid.

1 M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze;M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

2 Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi;M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

3 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku;Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.

4 Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ,We gosi idi-ike-Gi nile.

5 N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi,Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.

6 Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa;Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya.

7 Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa,Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.

8 Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.

9 Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di;Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.

10 Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova;Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.

11 Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa,Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;

12 Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile,Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.

13 Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi,Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.

14 Jehova nākwagide ndi nile nāda ada,O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala.

15 Anya ihe nile nēle anya Gi;Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

16 I nāsaghe aka-Gi,I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.

17 Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile,Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile.

18 Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya,Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu.

19 Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme;Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.

20 Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya;Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.