Abù Ọma 37 IGBOB

Abù Ọma nke Devid.

1 Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ,Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.

2 N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.

3 Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.

4 Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

5 Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

6 Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.

7 Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.

8 Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.

9 N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

10 Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.

11 Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.

12 Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.

13 Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia

14 Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:

15 Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,Agāb͕aji kwa uta-ha.

16 Ihe ntà onye ezi omume nwere di nmaKari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.

17 N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.

18 Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.

19 Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.

20 N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.

21 Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.

22 N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.

23 Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.

24 Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.

25 Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.

26 Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.

27 Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

28 N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.

29 Ndi ezi omume gēnweta ala,Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.

30 Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.

31 Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.

32 Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.

33 Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.

34 Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.

35 Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.

36 O we gabiga, ma, le, ọ nọgh:M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.

37 Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi:N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.

38 Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù:Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu.

39 Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia:Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.