Abù Ọma 77 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jeduthun si abù abù. Abù Ọma Esaf.

1 Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu;Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti.

2 N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ:Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi;Nkpuru-obim juru ka akasie ya.

3 M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku:M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah

4 I jidere ndi-nche nke anyam abua:Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu.

5 Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie,Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,

6 M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali:M'gēso obim tughari uche;Mọm we chọsie ike, si,

7 Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju?Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?

8 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo?Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?

9 Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke?Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah

10 M'we si, Ọriam ka nka bu;Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.

11 M'gēhota omume nile nke Ja;N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.

12 M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile,Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.

13 Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di:Ònye bu chi uku dika Chineke?

14 Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu:I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.

15 I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi,Bú umu Jekob na Josef. Selah

16 Miri huru Gi, Chineke;Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u:Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.

17 Igwe-oji nile wupuru miri;Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà:Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.

18 Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu;Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.

19 N'oké osimiri ka uzọ-Gi di,Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri,Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.