1 Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ;Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche:
2 Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha;Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche.
3 Ha amuwo ire-ha dika agwọ;Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha. Selah
4 Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu;Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike:Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile.
5 Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche;Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ;Ọnyà di iche iche ka ha siworom. Selah
6 Asirim Jehova, Chinekem ka I bu:Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.
7 Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam,I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile.
8 Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike;Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu. Selah
9 Ma isi ndi nọm buruburu,Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha.
10 Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha:Ya me ka ha dabà n'ọku;N'ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ.
11 Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa:Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.
12 Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala,Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.