Abù Ọma 7 IGBOB

Shiggaion nke Devid, nke ọ bùkuru Hehova, bayere okwu Kush, bú onye Benjamin.

1 Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo:Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:

2 Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.

3 Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;

4 Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ;(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)

5 Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;Ka ọ zọda kwa ndum n'ala,Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah

6 Bilie, Jehova, n'iwe-Gi,Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.

7 Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu:Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya.

8 Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

9 Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.

10 Ọtam dikwasi na Chineke,Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.

11 Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.

12 Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.

13 Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.

14 Le, ime ajọ ihe nēme ya;Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.

15 Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme.

16 Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya,Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.