1 Gi, Jehova, ka m'nākpọku;Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ:Ka I we ghara ib͕am nkiti,M'we yie ndi nārida n'olùlù.
2 Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi,Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.
3 Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe;Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo,Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.
4 Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di:Nye ha dika aka-ha si eme;Nyeghachi ha ihe ha mere.
5 N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova,Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo,Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.
6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.
7 Jehova bu ikem na ọtam;Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka:Obim we nāwuli elu n'ọṅù;M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.
8 Jehova buru ya ike,Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.