Abù Ọma 25 IGBOB

Abù Ọma nke Devid.

1 Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim.

2 Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi,Ekwela ka ihere mem;Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.

3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu.

4 Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile;Zím okporo-uzọ-Gi nile.

5 Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.

6 Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.

7 Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile:Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.

8 Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ.

9 Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé:Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.

10 Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwuN'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.

11 N'ihi aha-Gi, Jehova,B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.

12 Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa.

13 Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.

14 Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.

15 Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.

16 Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.

17 Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.

18 Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.

19 Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.

20 Debe nkpuru-obim, naputakwam:Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.

21 Ka izu-okè na izi-ezi chezim,N'ihi na elewom anya Gi.