1 Tonu Ja.Bùkuenu Jehova abù ọhu,Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya.
2 Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya:Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha.
3 Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú:Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.
4 N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ:Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma.
5 Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru:Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha.
6 Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha,Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha;
7 Ibọ̀ ọ́bọ̀ n'aru mba nile,Ibara ndi nile di iche iche nba;
8 Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha,Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru;