Abù Ọma 88 IGBOB

Abù, bú Abù Ọma Umu Kora; nke diri Onye-isi Abù; n'elu Mahalath Leannoth. Maschil Himan, bú onye-Ezrahait.

1 Jehova, Chineke nke nzọputam,N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:

2 Kwe ka ekperem bata n'iru Gi;Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:

3 N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim,Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.

4 Aguwom na ndi nārida n'olùlù;Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:

5 Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya,Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì,Ndi I nēchetaghi ọzọ;Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.

6 I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala,N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.

7 Ọnuma-Gi akwagidewom,I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah

8 I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya;I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú:Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.

9 Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala:Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi,Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.

10 Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu?Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah

11 Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì?Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?

12 Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri?Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe?

13 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova,Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.

14 Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim?N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?

15 Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata:Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.

16 Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim;Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.

17 Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile;Ha ab͕awom buruburu n'otù.