Abù Ọma 18 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke orù Jehova, bú Devid, onye gwara Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile, na n'ọbu-aka Sol: o we si,

1 Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.

2 Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu;Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.

3 Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova:Ewe zọputam n'aka ndi-irom.

4 Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.

5 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu:Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.

6 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,Ọ bu Chinekem ka m'nētiku:O nēsi n'ulo uku Ya nu olum,Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.

7 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji,Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.

8 Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:Afunwuru icheku site na ya.

9 O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida;Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.

10 O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie:O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.

11 Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu;Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

12 Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara,Akú-miri-ígwé na icheku ọku.

13 Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe,Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da;Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.

14 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.

15 Ewe hu ebe nile miri si erù,Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova,Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.

16 O si n'elu zìe, kurum,Dọputam n'ọtutu miri.

17 Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim.

18 Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:Ma Jehova burum ihe-ndabere.

19 O we me ka m'puta rue ebe sara mbara;Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.

20 Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di;Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.

21 N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.

22 N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum,Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.

23 M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem.

24 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di,Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.

25 N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;

26 N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.

27 N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala;Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.

28 N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam:Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.

29 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.

30 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.

31 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?

32 Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.

33 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam.

34 O nēzi akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.

35 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Aka-nri-Gi nākwagidekwam,Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.

36 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

37 Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

38 Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:Ha nāda n'okpuru ukwum abua.

39 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

40 Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

41 Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.

42 Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.

43 I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdom onye-isi mba nile ọzọNdi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

44 Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.

45 Ndi ala ọzọ nāta aru,Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.

46 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke nzọputam di kwa elu:

47 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.

48 Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom:I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike.

49 N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.