1 Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji:Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.
2 Jehova di uku nime Zaion;Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche.
3 Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya:Onye nsọ ka Ọ bu.
4 Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya;Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike,Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.
5 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu,Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di:Onye nsọ ka Ọ bu.
6 Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya,Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya;Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.
7 N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu:Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.
8 Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha:Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha,Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,