Abù Ọma 49 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma Umu Kora.

1 Nurunu nka, ndi nile di iche iche;Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:

2 Ma ndi di ala ma ndi di elu,Ọgaranya na ob͕eye n'otù.

3 Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile;Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.

4 M'gātọ ntim n'ala n'ilu:M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.

5 N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ,Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu,

6 Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha,Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu?

7 Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli,Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:

8 (N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia,Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)

9 Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi,Ghara ihu nbibi anya.

10 N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu,N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì,We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.

11 Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi,Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile;Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.

12 Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru:O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

13 Uzọ-ha nka buru ha nzuzu:Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ. Selah

14 Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye;Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu:Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu;Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.

15 Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ:N'ihi na Ọ gēkurum la. Selah

16 Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya,Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:

17 N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la;Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.

18 N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya,Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.

19 Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà;Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.