1 Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim,Ka ayi je n'ulo Jehova.
2 Ukwu-ayi eguzowoN'ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem;
3 Jerusalem, nke ewuworoDika obodo nke ejikọtara n'otù nke-ọma:
4 Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja,Iburu Israel ihe-àmà,Ikele aha Jehova.
5 N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe,Bú oche-eze nile ulo Devid nwere.
6 Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem:Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo.
7 Ka udo di n'ékpè-gi nile,Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu.
8 N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm,Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi.