Abù Ọma 45 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim; Abù Ọma nke Umu Kora. Maschil. Abù ihe-utọ.

1 Obim ab͕ọputawo okwu di nma:Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze:Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.

2 Emewo gi ka i ma nma kari umu madu;Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua:N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.

3 Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike,Ebube-gi na ima-nma-gi.

4 N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma,N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume:Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu.

5 Àkú-gi nile bu ihe di nkọ;Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi;Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.

6 Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi:Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu.

7 I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì:N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere giManu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.

8 Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile;Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu.

9 Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia:Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.

10 Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala;Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;

11 Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike:N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.

12 Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia;Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.

13 Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru:Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu.

14 N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze:Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya,Anēme ha ka ha biakute gi.

15 Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha:Ha gābà n'ulo uku eze.

16 Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà,I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile.