Abù Ọma 51 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid: mb͕e Netan, bú onye-amuma, biakutere ya, mb͕e ọ bakusiri Bat-sheba.

1 Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di:Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.

2 Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem,Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha.

3 N'ihi na mu onwem mara njehiem nile:Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile.

4 Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo,Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo:Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu,Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.

5 Le, n'ajọ omume ka amuputaram;Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.

6 Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ:Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe.

7 I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha:I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.

8 I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù;Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.

9 Zopu iru-Gi na nmehiem nile,Hichapu kwa ajọ omumem nile.

10 Kèrem obi di ọcha, Chineke;Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

11 Atupulam n'iru Gi;Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.

12 Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi:Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem.

13 M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile;Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi.

14 Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam;Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi.

15 Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua;Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.

16 N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya:Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ.

17 Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa:Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya.

18 Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ:I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem.