1 Jehova, Onye-nwe-ayi,Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé.
2 I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike,N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi,Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.
3 Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;
4 Gini ka madu bu, na I nēcheta ya;Na nwa nke madu, na I nēleta ya?
5 I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke,I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze.
6 I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua;Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:
7 Ewu na aturu na ehi, ha nile,Ha na anu ọhia;
8 Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri,Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile.