Abù Ọma 33 IGBOB

1 Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume:N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.

2 Werenu ubọ-akwara kele Jehova:Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.

3 Bùkueune Ya abù ọhu;Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.

4 N'ihi na okwu Jehova ziri ezi;Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi.

5 Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya:Uwa juputara n'ebere jehova.

6 Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe;Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.

7 Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe:Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.

8 Ka uwa nile tua egwu Jehova:Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.

9 N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di;Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.

10 Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile:Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.

11 Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi,Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.

12 Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya;Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.

13 Jehova siri n'elu-igwe legide anya;Ọ huwo umu madu nile;

14 Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-YaLekwasi ndi nile bi n'uwa anya;

15 Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù,Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.

16 Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa:Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.

17 Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu:Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.

18 Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya,Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;

19 Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu,Na idebe ha ndu n'oké unwu.

20 Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova:Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.

21 N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu,N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.