Abù Ọma 50 IGBOB

Abù Ọma Esaf.

1 Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo,We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.

2 Site na Zaion, bú ebe mazuru nma,Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.

3 Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti:Ọku nēripia n'iru Ya,Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.

4 Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù,Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:

5 Chikọtaranum ndi-eberem;Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.

6 Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya;N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah

7 Nuru, ndim, M'gēkwu kwa;Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi:Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.

8 Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba;Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.

9 M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi,M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.

10 N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.

11 Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.

12 Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.

13 M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?

14 Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:

15 Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.

16 Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?

17 Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,We tufue okwum nile n'azu gi.

18 Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.

19 I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ,Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.

20 I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.

21 Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti;I chère na adizum ka i di:M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.

22 Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke,Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu: