1 Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba!Ọtutu madu nēbili imegidem.
2 Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si,Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.
3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum,Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.
4 Ejim olum kpọkue Jehova,O we zam site n'ugwu nsọ Ya.
5 Mu onwem dinara ala, raru ura;Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.
6 M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta,Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.
7 Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem:N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì;I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.