Abù Ọma 109 IGBOB

Abú Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti;

2 N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem:Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.

3 Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu,We busom agha n'efu.

4 N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem:Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.

5 Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.

6 Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.

7 Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.

8 Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.

9 Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.

10 Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.

11 Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.

12 Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.

13 Ka eriri-umu-ya diri nbipu;N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.

14 Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.

15 Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile,Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.

16 N'ihi na o chetaghi ime ebere,O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye,Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.

17 Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya;Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.

18 O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,O we ba nime ya dika miri,Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.

19 Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya,Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.

20 Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia,Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.

21 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi:N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.

22 N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu,Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.

23 Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo:Arurupuwom dika igurube.

24 Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu;Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.

25 Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.

26 Yerem aka, Jehova, Chinekem;Zọputam dika ebere-Gi si di:

27 Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.

28 Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.

29 Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.

30 M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.