Abù Ọma 102 IGBOB

Ekpere nke onye ewedara n'ala mb͕e ike adighi ya, o we nēkwuwa okwu ntamu-ya n'iru Jehova.

1 Jehova, nuru ekperem,Ka ntikum ru kwa Gi nti.

2 Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu:Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ;N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.

3 N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku,Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.

4 Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua;N'ihi na echezọwom iri nrim.

5 Site n'olu ize-umemỌkpukpum araparawo n'anu-arum.

6 Eyirim okwolo nke ọzara;Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.

7 Amuruwom anya, we ghọIhe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo.

8 Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta;Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi.

9 N'ihi na eriwom ntu dika nri,Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.

10 Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi:N'ihi na I buliwom elu, we tufuem.

11 Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu;Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.

12 Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi;Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.

13 Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion:N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.

14 N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ,Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.

15 Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova,Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:

16 N'ihi na Jehova ewuwo Zaion,O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.

17 O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru,O ledaghi kwa ekpere-ha anya.

18 Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu:Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.

19 N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya;Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya;

20 Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ;Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;

21 Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion,Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;

22 Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù,Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.

23 O wedawo ikem n'uzọ;O bilatawo ubọchim nile.

24 Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile:N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.

25 Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.

26 Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide:Ha nile gāka kwa nká dika uwe;Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:

27 Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu