1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim.Jehova, Chinekem I di uku nke-uku;Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.
2 Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi;Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:
3 Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri:Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya;Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe:
4 Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe;Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
5 Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike,Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.
6 I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe;N'elu ugwu nile ka miri nēguzo.
7 Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga;Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;
8 (Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;)Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha.
9 I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya;Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.
10 Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu;N'etiti ugwu ka ha nērù:
11 Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu;Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.
12 N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi,Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.
13 I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri:Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.
14 I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-uloNēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu;Ime ka nri si n'ala puta:
15 Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria,Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu,Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.
16 Afọ nēju osisi nile nke Jehova;Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo;
17 Ebe umu-nnunu na-akù akwú:Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.
18 Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia;Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà.
19 O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà:Anyanwu mara ọdida-ya.
20 I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali;Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.
21 Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u,N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.
22 Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha,We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche.
23 Madu nāpu ga ọlu-yaGa kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.
24 Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!N'amam-ihe ka I meworo ha nile:Uwa juputara n'ihe I nwetara.
25 Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.
26 N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.
27 Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
28 I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.
29 I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.
30 I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha;I we me ka iru ala di ọhu.
31 Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi;Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile:
32 Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji;Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.
33 M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile:M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.
34 Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ:Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.