Abù Ọma 119 IGBOB

1 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu,Ndi nējeghari n'iwu jehova.

2 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu,Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya.

3 E, ha emeghi ajọ omume;N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije.

4 Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu,Ka ayi we debesie ha ike.

5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nileIdebe ukpuru-Gi nile!

6 Mb͕e ahu ihere agaghi-emem,Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di.

7 M'gēwere obi ziri ezi kele Gi,Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi.

8 Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe:Arapusilam arapu.

9 Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha?Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.

10 Obim nile ka m'wereworo chọ Gi:Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.

11 N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi,Ka m'we ghara imehie megide Gi.

12 Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova:Zím ukpuru-Gi nile.

13 Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọIkpé nile nke ọnu-Gi.

14 N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ,Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile.

15 N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche,M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya.

16 Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku:M'gaghi-echezọ okwu-Gi.

17 Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu;M'gēdebe kwa okwu-Gi.

18 Kpughepu anyam abua, ka m'we legideOké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.

19 Ọbìa ka m'bu n'uwa:Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu.

20 Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọO ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile.

21 I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike,Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.

22 Wepu ita-uta na nleda n'arum;N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile.

23 Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem:Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile.

24 Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku,Ha bu ndi nādum ọdu.

25 Nkpuru-obim nārapara n'ájá:Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu.

26 Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam:Gi zím ukpuru-Gi nile.

27 Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile:M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile.

28 Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú:Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike.

29 Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ:Were kwa amara nyem iwu-Gi.

30 Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo:Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum.

31 Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile:Jehova, emela ka ihere mem.

32 N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ,N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.

33 Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile:M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu.

34 Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi;M'gēwere kwa obim nile debe ya.

35 Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu;N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ

36 Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru,Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru.

37 Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga,Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.

38 Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike,Bú nke diri egwu-Gi.

39 Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga;N'ihi na ikpé-Gi nile di nma.

40 Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike:N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu.

41 Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova,Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di.

42 M'gāza kwa onye nātam uta okwu;N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi.

43 Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum;N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo.

44 M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nileRue mb͕e nile ebighi-ebi.

45 M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.

46 M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze,Ihere agaghi-emekwam.

47 Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku,Bú nke m'huworo n'anya.

48 M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya;M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.

49 Cheta okwu I gwara orù-Gi,Nke I meworom ka m'chere.

50 Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam:Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu.

51 Ndi-nganga akwawom emò nke-uku:Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem.

52 Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova,We kasie onwem obi.

53 Iwe di ọku ejidewom,N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi.

54 Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworomN'ulo ebe m'nọ dika ọbìa.

55 Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali,We debe iwu-Gi.

56 Nka ka m'nweworo,Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile.

57 Òkèm ka Jehova bu:Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile.

58 Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua:Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di.

59 Echèrem èchìchè uzọm nile,We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile.

60 Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya,Idebe ihe nile I nyere n'iwu.

61 Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu;Ma echezọghm iwu-Gi.

62 N'etiti abali ka m'gēbili ikele GiN'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi.

63 Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu,Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù.

64 Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi:Zím ukpuru-Gi nile.

65 I meworo orù-Gi ezi ihe,Jehova, dika okwu-Gi si di.

66 Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma;N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo.

67 Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama;Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo.

68 Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma;Zím ukpuru-Gi nile.

69 Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu:Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile.

70 Obi-ha bu nání abuba dika abuba;Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.

71 Ọ dim nma na ewedawom n'ala;Ka m'we muta ukpuru-Gi nile.

72 Iwu ọnu-Gi dim nmaKari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.

73 Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike:Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.

74 Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria;N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo.

75 Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume,Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala.

76 Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim,Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di.

77 Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu;N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku.

78 Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ:Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile.

79 Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem,Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile.

80 Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile,Ka ihere we ghara imem.

81 Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike:Ma okwu-Gi ka m'chereworo.

82 Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike,Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?

83 N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku;Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.

84 Ùbọchi nke orù-Gi di ole?Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe?

85 Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche,Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.

86 Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi:N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka.

87 Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa;Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.

88 Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu,M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi.

89 Jehova, rue mb͕e ebighi-ebiKa emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe.

90 Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di:I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo.

91 Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta;N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi.

92 Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku,Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.

93 Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile:N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu.

94 Ọ bu Gi nwem, zọputam;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.

95 Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì;Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche.

96 Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile;Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.

97 Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya!Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.

98 Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom;N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim.

99 Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche;N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.

100 Anamaghọta ihe kari ndi-okenye,N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo.

101 Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula,Ka m'we debe okwu-Gi.

102 Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem;N'ihi na I zíwom ihe.

103 Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ!Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.

104 M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe:N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.

105 Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum,Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.

106 Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike,Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.

107 Ewedawom n'ala nke-uku:Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di.

108 Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova,Zíkwam ikpé-Gi nile.

109 Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile;Ma echezọghm iwu-Gi.

110 Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya;Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia.

111 Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi;N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.

112 Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile,Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.

113 Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì:Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.

114 Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu:Okwu-Gi ka m'chereworo.

115 Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ;Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.

116 Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu;Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.

117 Kwaliem elu, ewe zọputam,M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.

118 I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.

119 I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.

120 Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.

121 Emewom ikpe ekpere na ezi omume:Arapulam nye ndi nēmeb͕um.

122 Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma:Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem.

123 Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike,Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.

124 Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di,Zíkwam ukpuru-Gi nile

125 Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe,Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.

126 Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu;Ha emebiwo iwu-Gi.

127 N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anyaKari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha.

128 N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi;Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.

129 Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu:N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha.

130 Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè;Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.

131 Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike;N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.

132 Chem iru, me-kwa-ram amara,Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.

133 Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi:Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.

134 B͕aputam na nmeb͕u nke madu:M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.

135 Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;Zíkwam ukpuru-Gi nile.

136 Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.

137 Onye ezi omume ka I bu Jehova,Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.

138 I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omumeNa ikwesi-ntukwasi-obi di uku.

139 Ekworom ekpochapuwom,N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.

140 Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.

141 Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya:Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.

142 Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi,Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu

143 Ahuhu na nkpà achọtawom:Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.

144 Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi:Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.

145 Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova:Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe.

146 Akpọkuwom I; zọputam,M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile.

147 Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi:Okwu-Gi nile ka m'chere.

148 Anyam abua buru nche-abali nile uzọ,Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi.

149 Nuru olum, dika ebere-Gi si di:Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu.

150 Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ;Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya.

151 Gi onwe-gi nọ nso, Jehova;Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu.

152 Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha.

153 Hu nweda-n'alam, dọputam;N'ihi na echezọghm iwu-Gi.

154 Kpe ọnum b͕aputakwam:Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu.

155 Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ;N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile.

156 Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova;Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu.

157 Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um;Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem.

158 Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi;N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.

159 Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya:Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu.

160 Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu;Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.

161 Ndi-isi esob͕uwom n'efu;Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha.

162 Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi,Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata.

163 Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú;Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.

164 Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi,N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi.

165 Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere;Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.

166 Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova,Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo.

167 Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile;Anamahu kwa ha n'anya nke-uku.

168 Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile;N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi.

169 Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova:Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe.

170 Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi:Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam.

171 Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto;N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile.

172 Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi;N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume.

173 Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo.

174 Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova;Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku.

175 Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi;Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.