Abù Ọma 136 IGBOB

1 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2 Kelenu Chineke kachasi chi nile:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3 Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4 Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5 Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

6 Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

7 Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

8 Bú anyuanwu ichi n'ehihie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

9 Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

10 Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

11 O we me ka Israel si n'etiti ha puta:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

12 Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

13 Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

14 O we me ka Israel gabiga n'etiti ya:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

15 Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

16 Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.

17 Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

19 Bú Saihon eze ndi-Amorait:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

20 Na Og eze Beshan:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

21 O we nye ala-ha ibu ihe-nketa:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

22 Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

23 Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

24 O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi.N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

25 Ọ nēnye anu-aru nile nri:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.