Abù Ọma 91 IGBOB

1 Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu,Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

2 M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike;I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.

3 N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà,Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.

4 Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi,Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba:Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.

5 I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali,Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;

6 Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri,Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.

7 Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi;Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi;Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.

8 Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide,We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.

9 N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm;N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;

10 Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi,Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.

11 N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi,Idebe gi n'uzọ-gi nile.

12 N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.

13 Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu:I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.

14 N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa:M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.

15 Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya;Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu:M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.