Abù Ọma 147 IGBOB

1 Tonu Ja;N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma;N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.

2 Jehova nēwuli Jerausalem elu;Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.

3 Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu,Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.

4 Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando;Ha nile ka Ọ nākpọ aha.

5 Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne;Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.

6 Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ:Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.

7 Werenu ekele za Jehova,Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:

8 Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.

9 Ọ nēnye anumanu nri-ya,Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.

10 Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.

11 Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,Ndi nēchere ebere-Ya.

12 Gi Jerusalem, nāja Jehova;To Chineke-gi, Zaion.

13 N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.

14 Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15 Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16 Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17 Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?

18 Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

19 Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.