1 Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm:Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.
2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam;Nucha akurum abua na obim.
3 N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam;Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.
4 Mu na madu efu anọkọghi;Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.
5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.
6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:
7 Ime ka ege nti olu ekele,Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya,Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.
9 Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù,Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:
10 Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha,Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo.
11 Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije:B͕aputam, me-kwa-ram amara.