Abù Ọma 71 IGBOB

1 Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo:Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.

2 N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu:Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam.

3 Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nileI nyewo iwu izọputam;N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4 Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu,N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5 N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova:Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6 N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem:Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem:Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

7 Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube;Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.

8 Ọnum gējuputa n'otuto-Gi,Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.

9 Etufulam na mb͕e agadi;Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

10 N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem;Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11 Si, Chineke arapuwo ya:Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12 Chineke, anọlam ebe di anya:Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

13 Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim;Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

14 Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi,We tukwasi otuto n'otuto-gi nile

15 Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi,Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi;N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.

16 M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia:M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.

17 Chineke, I zíwom ihe site na nwata;Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile.

18 Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke;Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-GiGosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.

19 Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu;Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi?

20 Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ,I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ,Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.

21 Me ka idi-ukum bakari uba,Gi chighari kwa kasiem obi.

22 Mu onwem gēji kwa une kele Gi,Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem:M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma,Gi Onye Nsọ nke Israel.

23 Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma;Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.