Abù Ọma 135 IGBOB

1 Tonu Ja.Tonu aha Jehova;Tonu Ya, ndi-orù Jehova:

2 Ndi nēguzo n'ulo Jehova,N'ogige nile nke ulo Chineke-ayi.

3 Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma:Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ.

4 N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya,Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya.

5 N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku,Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile.

6 Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo,N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.

7 Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo;O meworo miri-ozuzo àmùmà;Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

8 Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt,Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.

9 O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt,N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile.

10 Onye tib͕uru ọtutu mba,B͕u kwa ndi-eze di ike;

11 Bú Saihon eze ndi-Amorait,Na Og eze Beshan,Na ala-eze nile nke Kenean:

12 Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa,Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa.

13 Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi;Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

14 N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe,Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.

15 Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo,Ọlu aka madu.

16 Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu;Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;

17 Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti;Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha.

18 Ndi nēme ha gādi ka ha;E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

19 Ulo Israel, gọzienu Jehova:Ulo Eron, gọzienu Jehova:

20 Ulo Livai, gọzienu Jehova:Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova.