Abù Ọma 27 IGBOB

Abù Ọma nke Devid.

1 Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu?Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu?

2 Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum,Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala.

3 Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem,Obim agaghi-atu egwu:Ọ buru na agha ebilie imegidem,Na nka ka mu onwem nātukwasi obi.

4 Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ;Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum,Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.

5 N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ:Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya;N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu.

6 Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu;M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya;M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.

7 Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù:Me-kwa-ram amara, zakwam.

8 Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.

9 Ezonarilam iru-Gi;Ejila iwe wezuga orù-Gi:Iye-akam ka I buworo;Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.

10 N'ihi na nnam na nnem arapuwom,Ma Jehova gēkubatam.

11 Jehova, zím uzọ-Gi;Durukwam n'okporo-uzọ di lari,N'ihi ndi nēchem anwu.

12 Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.

13 M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma JehovaN'ala ndi di ndu?

14 Nēle anya Jehova:Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume;E, nēle anya Jehova.