1 Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim,O we zam.
2 Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha,Na n'ire aghughọ.
3 Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi,Gi ire aghughọ?
4 Àkú di nkọ nke dike,Ha na icheku-ọku nke osisi broom.
5 Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek,Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!
6 Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworoN'akuku onye nākpọ udo asì.