Abù Ọma 80 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim Eduth. Abù Ọma nke Esaf.

1 Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti,Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu;Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.

2 N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi,Je izọputa ayi.

3 Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

4 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?

5 I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri,I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.

6 I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù:Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha.

7 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

8 I si n'Ijipt ropu osisi vine:I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.

9 I doziri ọnọdu n'iru ya,O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.

10 Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.

11 Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.

12 N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?

13 Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya,Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.

14 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,

15 Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo,Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume.

16 Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya:Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì.

17 Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi,N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.

18 Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu:Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.