1 Chineke, bia ọsọsọ inaputam;Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.
2 Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere,Bú ndi nāchọ nkpuru-obim:Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.
3 Ka ha laghachi azu n'ihi ihere-ha,Bú ndi nāsi, Ehe, ehe!
4 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi;E, ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,Ka Chineke di uku.