Abù Ọma 103 IGBOB

Abù Ọma nke Devid.

1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim;Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.

2 Gọzie Jehova, nkpuru-obim,Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:

3 Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile;Onye nāgwọ ọria-gi nile;

4 Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi;Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:

5 Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi;Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.

6 Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕uEzi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe.

7 Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile,Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile.

8 Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara,Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.

9 Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu;Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.

10 Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi,Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.

11 N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa,Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya.

12 Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu,Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.

13 Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya,Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.

14 N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi;Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.

15 Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di;Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.

16 N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi;Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.

17 Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya,Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;

18 Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.

19 Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe;Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.

20 Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya,Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya,N'ige nti olu nke okwu-Ya.

21 Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile;Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.