Abù Ọma 31 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi:N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu.

2 Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa:Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.

3 N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu;Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.

4 I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta;N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.

5 N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe:I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.

6 Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.

7 Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi:N'ihi na I huwo nweda-n'alam;I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:

8 I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro;I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.

9 Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u:Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.

10 N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume:Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.

11 N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu:Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.

12 Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu:Aghọwom ihe nāla n'iyì.

13 N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu,Ujọ dim buruburu:Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem,Ha zubere iwepu ndum.

14 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova:Asiwom, Chinekem ka I bu.

15 N'aka-Gi ka mb͕em nile di:Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um.

16 Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè:Zọputam n'ihi ebere-Gi.

17 Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I:Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ.

18 Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i;Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume,Nime npako na nleda-anya.

19 Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi,Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu!

20 I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu:I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.

21 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu:N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike.

22 Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi:Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.

23 Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile:Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi,Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.